Akụkọ dị mkpa - Febụwarị 2, 2026
Akụkọ dị mkpa - Febụwarị 2, 2026
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Ndị ahịa amalitela ịzụ ahịa n'ahịa Ọmịcha Main Market dịka Gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra Steeti mechiri ahịa ahụ ruo otu izuụka.
- BBC Igbo gara n'ahịa ahụ n'ụbọchị Mọnde abalị nke ọnwa Febụwarị, 2026 ma chọpụta na ọtụtụ ndị mmadụ amalitela ire ahịa ebe ụfọdụ ụlọahịa ka mechiri emechi.
- Nke a na-abịa dịka otu Ipob nyere iwu si ka onye ọbụla ghara ịpụta n'ezi n'ụbọchị Mọnde na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa niile.
- Ezinaụlọ Ifunanya Nwangene agwala BBC na ha ga-eme nnyocha 'autopsy' iji chọpụta kpọmkwem ihe gburu nwa ha nwaanyị.
- Ha gwara BBC News Igbo na ha kpebiri nke a n'ihi akụkọ dị iche iche banyere etu ụlọọgwụ Federal Medical Centre (FMC) dị n'Abuja si kpaa agwa oge Ifunanya rutere n'ụlọọgwụ ahụ n'ụbọchị Satọde, abalị iri atọ na otu nke ọnwa Jenụwarị, 2026.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






